Akwụkwọ a bụ 'Nzúzù M Egbuo M' bụ akụkọ bànyere otu nwata nwoke anya erughị ala, bụ onye ejighị asụsụ, omenala na nsọala obodo ya wee kpọrọ ihe, malite n'oge ọ dị na nwata, wee ruo ogè o topùtara mmadụ.
Ya bụ nwa amadi, bụ Amọchie, onye obodo Ụmụezike, amaghị asụ asụsụ ya, ma ya fọdụzie inwe mmasị na ya, ma ọ bụ ịkụziri ya ụmụ ya, n'ihi na ọ hụtara ya dịka ihe enweghị uru ọbụla ọ ga-abara ya na ezeinaụlọ ya.
Nke kacha nke bụ na ọ kwasoro nwanne ya nwaanyị iko n'ebe ọ hụrụ ya na Lagos, lụọ ma kpọrọ ya ga gbàá akwụkwọ na Lagos ahụ, n'amaghị na ọ bụ nwanne ya nwaanyị, n'ihi na anya erughị ya ala. Ọ naghịkwa alaru ụlọ, ma ya fọdụzie ịma na e nwere ihe a na-akpọ nsọala.
Ka a na-ekwu nke ahụ, ọ kpụkọọrọ ụmụnna ya niile kpọchie n'ụlọ mkpọrọ n'ihi ịzọ oke ala oge nna ya nwụchara, maka na ọ maghị ebe oke ala nna ya siri dị.
Ebelebe gbuzịrị na ndụ nwa amadi a mgbe mmụọ na ndị ala màlitere ibuso ya agha.
Kedu ka ya na arụsị siri wee lụọ ọgụ?
Kedu ebe ya na ezinaụlọ ya nwetara onwe ha n'oge ikpeazụ?
Gịnị ka nzúzù ya wetaara ya?
Azịza niile a na otu ya bụ akụkọ siri wee gaa ka ị ga-ahụ n'ime akwụkwọ a, tinyere ọtụtụ ihe mmụta sochiri ya azụ.
Ngwùgwù a ga-atọ atọ, ọ dịghị maa ka a tụọ ya mbọ.
Gụọ ka i were anya gị hụ.